Diuteronomi 32:5
Deuteronomy 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe
Deuteronomy 32:5 in English
Deuteronomy 32:5 · Berean Standard Bible
His people have acted corruptly toward Him; the spot on them is not that of His children, but of a perverse and crooked generation.*
Context
3Aga m eto aha Onyenwe anyị
toonu ịdị ukwuu Chineke anyị! 4Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke,
ụzọ ya niile ziri ezi.
Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ,
onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. 5Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya,
ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe 6Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị
unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche?
Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu,
onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike? 7Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga,
tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga
jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị.
Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.