Native Bible

Deuteronomy 28:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.

Deuteronomy 28:48 in English

Deuteronomy 28:48 · Berean Standard Bible

you will serve your enemies the LORD will send against you in famine, thirst, nakedness, and destitution. He will place an iron yoke on your neck until He has destroyed you.

Context

46Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi. 47Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma. 48Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi. 49Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha, 50Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.