Native Bible

Deuteronomy 28:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma.

Deuteronomy 28:47 in English

Deuteronomy 28:47 · Berean Standard Bible

Because you did not serve the LORD your God with joy and gladness of heart in all your abundance,

Context

45Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị. 46Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi. 47Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma. 48Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi. 49Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.