Diuteronomi 28:46
Deuteronomy 28:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi.
Deuteronomy 28:46 in English
Deuteronomy 28:46 · Berean Standard Bible
These curses will be a sign and a wonder upon you and your descendants forever.
Context
44Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ. 45Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị. 46Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi. 47Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma. 48Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.