Native Bible

Deuteronomy 28:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ.

Deuteronomy 28:44 in English

Deuteronomy 28:44 · Berean Standard Bible

He will lend to you, but you will not lend to him. He will be the head, and you will be the tail.

Context

42Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị. 43Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ. 44Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ. 45Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị. 46Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.