Native Bible

Deuteronomy 28:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị.

Deuteronomy 28:50 in English

Deuteronomy 28:50 · Berean Standard Bible

a ruthless nation with no respect for the old and no pity for the young.

Context

48Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi. 49Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha, 50Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị. 51Ha ga-erichapụ mkpụrụ nke anụ ụlọ gị niile na mkpụrụ nke ihe ubi gị niile tutu ruo mgbe ị ghọrọ ihe e bibiri ebibi. O nwekwaghị ihe ga-afọdụrụ gị, maọbụ ọka, maọbụ mmanya ọhụrụ maọbụ mmanụ oliv, maọbụ ụmụ ehi maọbụ ewu na atụrụ gị mụrụ, ruo mgbe e mere ka ị laa nʼiyi. 52Mba ahụ ga-anọchigide obodo ndị ahụ niile dị nʼala gị tutu ruo mgbe mgbidi ndị ahụ niile e wusiri ike, nke ị na-atụkwasị obi dara. Ọ ga-anọchigide ndị ahụ niile dị nʼala ahụ niile Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.