Native Bible

Deuteronomy 26:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị.

Deuteronomy 26:8 in English

Deuteronomy 26:8 · Berean Standard Bible

Then the LORD brought us out of Egypt with a mighty hand and an outstretched arm, with great terror, signs, and wonders.

Context

6Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị. 7Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị. 8Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị. 9Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 10Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.