Diuteronomi 26:6
Deuteronomy 26:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị.
Deuteronomy 26:6 in English
Deuteronomy 26:6 · Berean Standard Bible
But the Egyptians mistreated us and afflicted us, putting us to hard labor.
Context
4Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị. 5Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ.* Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ. 6Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị. 7Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị. 8Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.