Native Bible

Deuteronomy 26:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị.

Deuteronomy 26:7 in English

Deuteronomy 26:7 · Berean Standard Bible

So we called out to the LORD, the God of our fathers; and the LORD heard our voice and saw our affliction, toil, and oppression.

Context

5Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ.* Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ. 6Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị. 7Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị. 8Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị. 9Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.