Diuteronomi 25:16
Deuteronomy 25:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ.
Deuteronomy 25:16 in English
Deuteronomy 25:16 · Berean Standard Bible
For everyone who behaves dishonestly in regard to these things is detestable to the LORD your God.
Context
14Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta. 15Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 16Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ. 17Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta. 18Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.