Diuteronomi 25:18
Deuteronomy 25:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.
Deuteronomy 25:18 in English
Deuteronomy 25:18 · Berean Standard Bible
how they met you on your journey when you were tired and weary, and they attacked all your stragglers; they had no fear of God.
Context
16Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ. 17Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta. 18Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke. 19Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i nwere onwe gị site nʼaka ndị iro gbara gị gburugburu, mgbe o mere ka i zuru ike nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, ime ka i nweta ya, ị ghaghị igbuchapụ ndị Amalek, ka ha bụrụ ndị a na-agaghị echetakwa ọzọ nʼokpuru eluigwe. Echefukwala ime otu a.
25:4 Ọtụtụ oge, ehi bụ ihe na-azọcha ọka nʼebe ịzọcha ọka. A na-eji osisi kegide anụ ndị a na nkume igwe nri, mgbe ha na-agagharị, ụkwụ ha bụ ihe na-azọcha mkpụrụ ọka site nʼigbugbo ya. Nʼotu oge ahụ, nkume igwe nri ahụ na-egweri ọka ndị a ka ọ bụrụ ụtụ ọka.
25:13 Nke ukwu na nke nta
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.