Native Bible

Deuteronomy 25:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Deuteronomy 25:15 in English

Deuteronomy 25:15 · Berean Standard Bible

You must maintain accurate and honest weights and measures, so that you may live long in the land that the LORD your God is giving you.

Context

13Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.* 14Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta. 15Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 16Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ. 17Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.