Native Bible

Deuteronomy 25:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.*

Deuteronomy 25:13 in English

Deuteronomy 25:13 · Berean Standard Bible

You shall not have two differing weights in your bag, one heavy and one light.

Context

11Mgbe ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụrụ na nwunye otu nʼime ha abịa ịnapụta di ya site nʼaka onye na-eti ya ihe, ma nwanyị ahụ esetipụ aka jide nwoke ahụ nʼamụ ya, 12a ga-egbupụ aka nwanyị ahụ. Ebere adịghị ya. 13Enwela ụzọ ihe ọtụtụ abụọ nʼime akpa gị, nke dị arọ, na nke na-adịghị arọ.* 14Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta. 15Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.