Diuteronomi 16:9
Deuteronomy 16:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.
Deuteronomy 16:9 in English
Deuteronomy 16:9 · Berean Standard Bible
You are to count off seven weeks from the time you first put the sickle to the standing grain.
Context
7Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị. 8Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla. 9Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị. 10Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị. 11Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.