Diuteronomi 16:10
Deuteronomy 16:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.
Deuteronomy 16:10 in English
Deuteronomy 16:10 · Berean Standard Bible
And you shall celebrate the Feast of Weeks * to the LORD your God with a freewill offering that you give in proportion to how the LORD your God has blessed you,
Context
8Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla. 9Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị. 10Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị. 11Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya. 12Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.