Diuteronomi 16:11
Deuteronomy 16:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.
Deuteronomy 16:11 in English
Deuteronomy 16:11 · Berean Standard Bible
and you shall rejoice before the LORD your God in the place He will choose as a dwelling for His Name—you, your sons and daughters, your menservants and maidservants, and the Levite within your gates, as well as the foreigner, the fatherless, and the widows among you.
Context
9Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị. 10Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị. 11Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya. 12Cheta na ị bụrị ohu nʼala Ijipt, nʼihi nke a, unu echefula iwu ndị a. 13Mmenụ mmemme ụlọ Ikwu. Unu aghaghị ime ya ụbọchị asaa mgbe unu wechara ihe ubi, ya bụ, mgbe unu chịkọtachara ọka site nʼebe ịzọcha ọka, nakwa ebe ịzọcha mmanya unu niile
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.