Diuteronomi 16:20
Deuteronomy 16:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Deuteronomy 16:20 in English
Deuteronomy 16:20 · Berean Standard Bible
Pursue justice, and justice alone, so that you may live, and you may possess the land that the LORD your God is giving you.
Context
18Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile. 19Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. 20Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 21Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye Onyenwe anyị Chineke gị. 22Eguzokwala ogidi nkume ọbụla nʼihi na ha bụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ asị.
16:1 Nke a bụ nʼetiti ọnwa atọ na ọnwa anọ nʼafọ, dịka anyị si agụ afọ nke anyị.
16:21 Ikpere chi ndị ọzọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.