Diuteronomi 16:18
Deuteronomy 16:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile.
Deuteronomy 16:18 in English
Deuteronomy 16:18 · Berean Standard Bible
You are to appoint judges and officials for your tribes in every town that the LORD your God is giving you. They are to judge the people with righteous judgment.
Context
16Ugboro atọ nʼafọ ka ndị ikom unu niile aghaghị ịbịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị unu, nʼebe ọ ga-ahọpụta: nʼoge mmemme ndị a: Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, Mmemme Izu Ụka asaa na Mmemme Ụlọ Ikwu. Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu Onyenwe anyị. 17Onye ọbụla ga-eweta onyinye dịka o nwere ike na dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị gọzie ya. 18Ị ga-ahọpụta ndị ikpe, na ndịisi ozi nʼebo niile, na nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. Ha ga-eme ka ezi ikpe dịrị ndị mmadụ niile. 19Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. 20Gbasoo ikpe ziri ezi, mee ka ikpe ziri ezi dịgide, ka ị dịrị ndụ, nweta ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.