Native Bible

Deuteronomy 14:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha.

Deuteronomy 14:20 in English

Deuteronomy 14:20 · Berean Standard Bible

But you may eat any clean bird.

Context

18na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ. 19Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha, 20Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha. 21Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke gị ka ị bụ. Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya. 22Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.