Emọs 8:9
Amos 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “Aga m eme ka anyanwụ daa* nʼetiti ehihie, ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
Amos 8:9 in English
Amos 8:9 · Berean Standard Bible
And in that day, declares the Lord GOD, I will make the sun go down at noon, and I will darken the earth in the daytime.
Context
7Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.” 8Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,
ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?
Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,
a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa
dịka iyi Ijipt. 9“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Aga m eme ka anyanwụ daa* nʼetiti ehihie,
ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị. 10Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ;
gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa.
Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe,
meekwa ka unu kpụchaa isi unu.
Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ.
Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu. 11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,
ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,
kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.