Emọs 8:7
Amos 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”
Amos 8:7 in English
Amos 8:7 · Berean Standard Bible
The LORD has sworn by the Pride of Jacob: “I will never forget any of their deeds.
Context
5na-asị,
“Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe
ka anyị ree mkpụrụ ubi,
na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ
ka anyị ree ọka wiiti?”
Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta,
na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu,
na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu. 6Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye,
jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa,
ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti. 7Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.” 8Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,
ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?
Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,
a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa
dịka iyi Ijipt. 9“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Aga m eme ka anyanwụ daa* nʼetiti ehihie,
ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.