Emọs 8:10
Amos 8:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, meekwa ka unu kpụchaa isi unu. Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.
Amos 8:10 in English
Amos 8:10 · Berean Standard Bible
I will turn your feasts into mourning and all your songs into lamentation. I will cause everyone to wear sackcloth and every head to be shaved. I will make it like a time of mourning for an only son, and its outcome like a bitter day.
Context
8Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,
ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?
Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,
a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa
dịka iyi Ijipt. 9“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Aga m eme ka anyanwụ daa* nʼetiti ehihie,
ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị. 10Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ;
gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa.
Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe,
meekwa ka unu kpụchaa isi unu.
Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ.
Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu. 11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,
ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,
kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị. 12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ,
sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ;
ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị,
ma ha agaghị achọta ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.