Emọs 3:14
Amos 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, mee ka ha daa nʼala.
Amos 3:14 in English
Amos 3:14 · Berean Standard Bible
On the day I punish Israel for their transgressions, I will visit destruction on the altars of Bethel; the horns of the altar will be cut off, and they will fall to the ground.
Context
12Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta
naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,
otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,
na nkuku isi ihe ndina*
na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.*” 13“Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri. 14“Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha,
aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel.
Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa,
mee ka ha daa nʼala. 15Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi,
na nke ha wuru maka oge okpomọkụ;
aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo.
Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
3:9 Maọbụ, Werenụ ọnọdụ unu
3:9 A na-eme nʼime ya
3:12 Ndị na-edina nʼelu akwa dara oke ọnụahịa
3:12 Ọ bụ nʼọnụ akụkụ ihe ndina na akwa ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.