Emọs 3:12
Amos 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm, otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria, na nkuku isi ihe ndina* na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.*”
Amos 3:12 in English
Amos 3:12 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “As the shepherd snatches from the mouth of the lion two legs or a piece of an ear, so the Israelites dwelling in Samaria will be rescued having just the corner of a bed or the cushion of a couch.*
Context
10“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ
nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.” 11Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu;
ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike,
ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.” 12Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta
naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,
otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,
na nkuku isi ihe ndina*
na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.*” 13“Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri. 14“Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha,
aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel.
Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa,
mee ka ha daa nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.