Emọs 3:10
Amos 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
Amos 3:10 in English
Amos 3:10 · Berean Standard Bible
“For they know not how to do right,” declares the LORD. “They store up violence and destruction in their citadels.”
Context
8Ọdụm agbọọla ụja,
o nwere onye na-agaghị atụ egwu?
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,
onye ga-ahapụ ibu amụma? 9Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd
na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị,
“Zukọtanụ* nʼelu ugwu niile nke Sameria
ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya
na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.*” 10“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ
nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.” 11Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu;
ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike,
ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.” 12Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta
naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,
otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,
na nkuku isi ihe ndina*
na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.*”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.