Emọs 3:8
Amos 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọdụm agbọọla ụja, o nwere onye na-agaghị atụ egwu? Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, onye ga-ahapụ ibu amụma?
Amos 3:8 in English
Amos 3:8 · Berean Standard Bible
The lion has roared— who will not fear? The Lord GOD has spoken— who will not prophesy?
Context
6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,
ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?
Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị? 7Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla
tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya
ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma. 8Ọdụm agbọọla ụja,
o nwere onye na-agaghị atụ egwu?
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,
onye ga-ahapụ ibu amụma? 9Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd
na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị,
“Zukọtanụ* nʼelu ugwu niile nke Sameria
ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya
na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.*” 10“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ
nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.