Native Bible

Amos 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?

Amos 3:6 in English

Amos 3:6 · Berean Standard Bible

If a ram’s horn sounds in a city, do the people not tremble? If calamity comes to a city, has not the LORD caused it?

Context

4Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu? 5Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? 6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị? 7Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma. 8Ọdụm agbọọla ụja, o nwere onye na-agaghị atụ egwu? Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, onye ga-ahapụ ibu amụma?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.