Emọs 3:6
Amos 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
Amos 3:6 in English
Amos 3:6 · Berean Standard Bible
If a ram’s horn sounds in a city, do the people not tremble? If calamity comes to a city, has not the LORD caused it?
Context
4Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa
ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ?
Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya,
mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu? 5Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala
ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?
Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi
ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? 6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,
ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?
Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị? 7Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla
tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya
ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma. 8Ọdụm agbọọla ụja,
o nwere onye na-agaghị atụ egwu?
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,
onye ga-ahapụ ibu amụma?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.