Emọs 3:5
Amos 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?
Amos 3:5 in English
Amos 3:5 · Berean Standard Bible
Does a bird land in a snare where no bait has been set? Does a trap spring from the ground when it has nothing to catch?
Context
3Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije
ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta? 4Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa
ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ?
Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya,
mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu? 5Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala
ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?
Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi
ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? 6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,
ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?
Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị? 7Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla
tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya
ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.