Emọs 3:4
Amos 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?
Amos 3:4 in English
Amos 3:4 · Berean Standard Bible
Does a lion roar in the forest when he has no prey? Does a young lion growl in his den if he has caught nothing?
Context
2“Naanị unu ka m họọrọ
nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa;
Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ
nʼihi mmehie unu niile.” 3Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije
ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta? 4Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa
ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ?
Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya,
mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu? 5Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala
ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?
Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi
ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? 6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,
ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?
Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.