Ọrụ Ndị Ozi 15:16
Acts 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie,
Acts 15:16 in English
Acts 15:16 · Berean Standard Bible
‘After this I will return and rebuild the fallen tent of David. Its ruins I will rebuild, and I will restore it,
Context
14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya. 15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya, 16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi,
aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada.
Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa,
aga m emekwa ka ọ guzozie, 17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị,
ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m,
ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’* 18Nke a amaara site na mgbe ochie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.