Ọrụ Ndị Ozi 15:14
Acts 15:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya.
Acts 15:14 in English
Acts 15:14 · Berean Standard Bible
Simon * has told us how God first visited the Gentiles to take from them a people to be His own.
Context
12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ. 13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị. 14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya. 15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya, 16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi,
aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada.
Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa,
aga m emekwa ka ọ guzozie,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.