Ọrụ Ndị Ozi 13:47
Acts 13:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’*”
Acts 13:47 in English
Acts 13:47 · Berean Standard Bible
For this is what the Lord has commanded us: ‘I have made you a light for the Gentiles, to bring salvation to the ends of the earth.’*”
Context
45Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu. 46Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. 47Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu,
“ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’*” 48Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. 49Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.