Ọrụ Ndị Ozi 13:49
Acts 13:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ.
Acts 13:49 in English
Acts 13:49 · Berean Standard Bible
And the word of the Lord spread throughout that region.
Context
47Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu,
“ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’*” 48Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. 49Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ. 50Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ. 51Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.