Ọrụ Ndị Ozi 13:45
Acts 13:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu.
Acts 13:45 in English
Acts 13:45 · Berean Standard Bible
But when the Jews saw the crowds, they were filled with jealousy, and they blasphemously contradicted what Paul was saying.
Context
43Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke. 44Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị. 45Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu. 46Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. 47Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu,
“ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,
ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’*”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.