Ọrụ Ndị Ozi 1:21
Acts 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
Acts 1:21 in English
Acts 1:21 · Berean Standard Bible
Therefore it is necessary to choose one of the men who have accompanied us the whole time the Lord Jesus went in and out among us,
Context
19Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara. 20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma:
“ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’*
na,
“ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’* 21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.” 23Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.