Ọrụ Ndị Ozi 1:22
Acts 1:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
Acts 1:22 in English
Acts 1:22 · Berean Standard Bible
beginning from John’s baptism until the day Jesus was taken up from us. For one of these must become a witness with us of His resurrection.”
Context
20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma:
“ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’*
na,
“ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’* 21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.” 23Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.* 24Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.