Ọrụ Ndị Ozi 1:20
Acts 1:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’* na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’*
Acts 1:20 in English
Acts 1:20 · Berean Standard Bible
“For it is written in the book of Psalms: ‘May his place be deserted; let there be no one to dwell in it,’* and, ‘May another take his position.’*
Context
18Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa. 19Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara. 20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma:
“ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’*
na,
“ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’* 21Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị, 22bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.