Ọrụ Ndị Ozi 1:18
Acts 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
Acts 1:18 in English
Acts 1:18 · Berean Standard Bible
(Now with the reward for his wickedness Judas bought a field; there he fell headlong and burst open in the middle, and all his intestines spilled out.
Context
16“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga. 17Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.” 18Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa. 19Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara. 20Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma:
“ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’*
na,
“ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.