Native Bible

2 Timothy 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.

2 Timothy 2:13 in English

2 Timothy 2:13 · Berean Standard Bible

if we are faithless, He remains faithful, for He cannot deny Himself.

Context

11Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi: Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ, anyị ga-esokwa ya dị ndụ. 12Ọ bụrụ na anyị anagide, anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, ọ ga-ajụkwa anyị. 13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya. 14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi. 15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.