2 Timoti 2:13
2 Timothy 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.
2 Timothy 2:13 in English
2 Timothy 2:13 · Berean Standard Bible
if we are faithless, He remains faithful, for He cannot deny Himself.
Context
11Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi:
Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ,
anyị ga-esokwa ya dị ndụ. 12Ọ bụrụ na anyị anagide,
anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị.
Ọ bụrụ na anyị ajụ ya,
ọ ga-ajụkwa anyị. 13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe,
ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi,
nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya. 14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi. 15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.