2 Timoti 2:11
2 Timothy 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi: Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ, anyị ga-esokwa ya dị ndụ.
2 Timothy 2:11 in English
2 Timothy 2:11 · Berean Standard Bible
This is a trustworthy saying: If we died with Him, we will also live with Him;
Context
9Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi. 11Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi:
Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ,
anyị ga-esokwa ya dị ndụ. 12Ọ bụrụ na anyị anagide,
anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị.
Ọ bụrụ na anyị ajụ ya,
ọ ga-ajụkwa anyị. 13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe,
ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi,
nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.