2 Timoti 2:14
2 Timothy 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi.
2 Timothy 2:14 in English
2 Timothy 2:14 · Berean Standard Bible
Remind the believers of these things, charging them before God * to avoid quarreling over words, which succeeds only in leading the listeners to ruin.
Context
12Ọ bụrụ na anyị anagide,
anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị.
Ọ bụrụ na anyị ajụ ya,
ọ ga-ajụkwa anyị. 13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe,
ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi,
nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya. 14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi. 15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma. 16Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.