2 Timoti 2:15
2 Timothy 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
2 Timothy 2:15 in English
2 Timothy 2:15 · Berean Standard Bible
Make every effort to present yourself approved to God, an unashamed workman who accurately handles the word of truth.
Context
13Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe,
ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi,
nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya. 14Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi. 15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma. 16Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa. 17Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.