2 Samuel 3:33
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?
2 Samuel 3:33 in English
2 Samuel 3:33 · Berean Standard Bible
And the king sang this lament for Abner: “Should Abner die the death of a fool?
Context
31Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ. 32Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna. 33Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị,
“O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu? 34E kekwaghị aka gị abụọ ihe.
E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ.
Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.”
Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya. 35Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.