2 Samuel 3:32
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna.
2 Samuel 3:32 in English
2 Samuel 3:32 · Berean Standard Bible
When they buried Abner in Hebron, the king wept aloud at Abner’s tomb, and all the people wept.
Context
30Ya mere, Joab na Abishai nwanne ya gburu Abna, nʼihi na Abna gburu nwanne ha Asahel nʼagha Gibiọn. 31Emesịa, Devid kpọrọ Joab na ndị niile so ya sị ha, “Dọwaanụ uwe unu, yikwasị onwe unu akwa mkpe, jegharịakwanụ nʼọnọdụ iru ụjụ nʼihi Abna.” Eze, bụ Devid nʼonwe ya so ndị bu ozu Abna nʼazụ. 32Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna. 33Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị,
“O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu? 34E kekwaghị aka gị abụọ ihe.
E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ.
Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.”
Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.