2 Samuel 3:34
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E kekwaghị aka gị abụọ ihe. E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ. Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.” Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya.
2 Samuel 3:34 in English
2 Samuel 3:34 · Berean Standard Bible
Your hands were not bound, your feet were not fettered. As a man falls before the wicked, so also you fell.” And all the people wept over him even more.
Context
32Ha liri Abna na Hebrọn. Eze na ndị Izrel niile kwara akwa nʼakụkụ ili ahụ nʼihi Abna. 33Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị,
“O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu? 34E kekwaghị aka gị abụọ ihe.
E kekwaghị ụkwụ gị abụọ agbụ.
Ị nwụrụ dịka onye ndị ajọ omume gburu.”
Mmadụ niile bekwara akwa ọzọ nʼihi ya. 35Mgbe ahụ, ndị mmadụ bịakwutere Devid rịọọ ka o ritụ ihe, mgbe ìhè ụbọchị ka dị, ma Devid ṅụrụ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m edetụ achịcha maọbụ ihe ọbụla ọzọ ọnụ tutu ruo mgbe anyanwụ dara.” 36Ndị mmadụ nụrụ ihe o kwuru, okwu ahụ tọkwara ha ụtọ. Nʼezie, ihe niile eze mere tọrọ ha ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.