2 Samuel 23:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
2 Samuel 23:8 in English
2 Samuel 23:8 · Berean Standard Bible
These are the names of David’s mighty men: Josheb-basshebeth the Tahchemonite * was chief of the Three.* He wielded his spear against * eight hundred men, whom he killed at one time.
Context
6Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu,
nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta. 7Onye ọbụla metụrụ ogwu aka,
bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe.
A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.” 8Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere:
Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha. 9Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha.* Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ, 10ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.