2 Samuel 23:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
2 Samuel 23:6 in English
2 Samuel 23:6 · Berean Standard Bible
But the worthless are all like thorns raked aside, for they can never be gathered by hand.
Context
4Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta
nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị.
Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara
nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’ 5“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ.
Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya,
Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile.
Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke.
Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile. 6Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu,
nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta. 7Onye ọbụla metụrụ ogwu aka,
bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe.
A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.” 8Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere:
Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.