Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

2 Samuel 22:30 in English

2 Samuel 22:30 · Berean Standard Bible

For in You I can charge an army; with my God I can scale a wall.

Context

28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala. 29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.