2 Samuel 22:32
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
2 Samuel 22:32 in English
2 Samuel 22:32 · Berean Standard Bible
For who is God besides the LORD? And who is the Rock except our God?
Context
30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha.
Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke? 33Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 34Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.