Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

2 Samuel 22:33 in English

2 Samuel 22:33 · Berean Standard Bible

God is my strong fortress and He makes my way clear.

Context

31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke? 33Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 34Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. 35Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.